Psalms 13

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Ekpere maka nnapụta

1Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị?
Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?
2Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba
nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m?
Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m?

3Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m.
Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ;
4mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,”
mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ.

5Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ;
mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị.
6Aga m abụku Onyenwe anyị abụ,
nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.
Copyright information for IboBIU